30. Umu-ndikom Nedab kwa; Seled, na Apaim: Seled we nwua nēnweghi umu-ndikom.
31. Umu-ndikom Apaim kwa; Ishi. Umu-ndikom Ishi kwa; Sheshan. Umu-ndikom Sheshan kwa; Ahlai.
32. Umu-ndikom Jada kwa, bú nwa-nne Shamai; Jeta, na Jonatan: Jeta we nwua nēnweghi umu-ndikom.
33. Umu-ndikom Jonatan kwa; Pelet, na Zaza. Ndia bu umu-ndikom Jerahmeel.
34. Ma Sheshan enweghi umu-ndikom, nání umu-ndinyom ka o nwere. Sheshan nwe-kwa-ra orù, bú onye Ijipt, aha-ya bu Jaha.