1. Ihe Emere 2:21-24 Bible Nso (IGBOB)

21. Emesia Hezron bakuru nwa-nwayi Makia, bú nna Gilead; ma nwoke ahu lutara ya mb͕e ya onwe-ya b͕ara ọgu arọ atọ; o we muara ya Segub.

22. Segub we mua Jaia, nke nwere orú obodo na atọ n'ala Gilead.

23. Geshua na Eram we nara ha Havot-jaia, ha na Kenat, na umu-obodo-ya, bú ọgu obodo atọ. Ndia nile bu umu-ndikom Makia nna Gilead.

24. Ma mb͕e Hezron nwusiri nime Keleb-efrata, mb͕e ahu nwunye Hezron, bú Abia, we muara ya Ashua nna Tekoa.

1. Ihe Emere 2