4. Nkpọkọta ahu nile we si na ha gēme otú a: n'ihi na okwu ahu ziri ezi n'anya ndi Israel nile.
5. Devid we kpọkọta Israel nile, site na Shaihoa nke Egypt we rue nbata Hemat, ime ka ib͕e Chineke si na Kiriat-jearim bia.
6. Devid we rigo, ya na Israel nile, rue Beala, rue Kiriat-jearim, nke Juda nwere, isi n'ebe ahu bugota ib͕e Chineke, bú Jehova, Onye nānọkwasi cherubim, nke akpọkwasiri Aha ahu.
7. Ha we me ka ub͕ọ-ala ọhu būru ib͕e Chineke, ha we buputa ya n'ulo Abinadab: Uza na Ahio we nēdu ub͕ọ-ala ahu.
8. Devid na Israel nile nēwere ike-ha nile gba egwú n'iru Chineke, were kwa abù, were kwa ubọ-akwara, na une, na egwú-otiti, na ájà, na opì.
9. Ha we biarue ebe-nzọcha-ọka Kidon, Uza we setia aka-ya ijide ib͕e ahu; n'ihi na ehi nāb͕a ukwu.
10. Iwe Jehova we di ọku megide Uza, O we tib͕ue ya, n'ihi na o setiri aka-ya metu ib͕e ahu: o we nwua n'ebe ahu n'iru Chineke.
11. Iwe Devid we di ọku, n'ihi na Jehova tiwaputara ntiwa megide Uza: o we kpọ ebe ahu Perez-uza, rue ta.
12. Devid we tua egwu Chineke n'ubọchi ahu, si, M'gēsi aṅa me ka ib͕e Chineke biakutem?
13. Devid ewezugaghi kwa ib͕e ahu nye onwe-ya rue obodo Devid, ma o buzugara ya rue ulo Obed-edom, bú onye Gat.