1. Ihe Emere 11:3-9 Bible Nso (IGBOB)

3. Ndi-okenye nile nke Israel we biakute eze rue Hebron; ha na Devid we b͕a ndu nime Hebron n'iru Jehova; ha we te Devid manu ibu eze Israel, dika okwu Jehova n'aka Samuel si di.

4. Devid na Israel nile we jerue Jerusalem (nke ahu bu Jebus); ma n'ebe ahu ka ndi Jebus, ndi bi n'ala ahu, nọ.

5. Ndi bi na Jebus we si Devid, I gaghi-abata n'ebe a. Devid we were ebe ewusiri ike nke Zaion; nke ahu bu obodo Devid.

6. Devid we si, Onye ọ bula nke buru uzọ tib͕u ndi Jebus gābu onye-isi na ọchi-agha. Joab nwa Zeruaia we buru uzọ rigo, o we buru onye-isi.

7. Devid we biri n'ebe ahu ewusiri ike; n'ihi ya ka ha kpọrọ ya obodo Devid.

8. O we wue obodo buruburu, site na Milo we rue buruburu ya: ma Joab mere ka obodo fọduru di ndu.

9. Devid we nāga n'iru, nēje nādi uku; Jehova nke usu nile nke ndi-agha nọye-kwa-ra ya.

1. Ihe Emere 11