1. Ihe Emere 1:50-54 Bible Nso (IGBOB)

50. Beal-hanan we nwua, Hedad we buru eze n'ọnọdu-ya; aha obodo-ya bu Pai: aha nwunye-ya bu Mehetabel nwa Matred, bú nwa-nwayi Me-zahab.

51. Hedad we nwua. Ndi-isi Edom bu kwa; Timna onye-isi, Alia onye-isi, Jetet onye-isi;

52. Ọhọlibama onye-isi, Ila onye-isi, Pinon onye-isi;

53. Kenaz onye-isi, Timan onye-isi, Mibza onye-isi;

54. Magdiel onye-isi, Iram onye-isi. Ndia bu ndi-isi Edom.

1. Ihe Emere 1